Psalms 112

Ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume

1Toonu Onyenwe anyị.

Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị;
onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile.

2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;
ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.
3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya;
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị,
nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume.
5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,
onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.

6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya;
a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;
obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla;
nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri.
9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche,
ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.

10Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya,
ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ;
olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
Copyright information for IboBIU